Ọnu-Ọgugu 14:26-30 Bible Nso (IGBOB)

26. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

27. Rùe ole mb͕e ka M'gānagide nzukọ ọjọ nka nke nātamu ntamu megidem? ntamu nile nke umu Israel, nke ha onwe-ha nātamu megidem, ka M'nuworo.

28. Si ha, Mu onwem nādi ndu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, dika unu kwuworo na ntim, otú a ka M'nāghaghi ime unu:

29. n'ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi tamuworo ntamu megidem,

30. unu onwe-unu agaghi-abà n'ala ahu ma-ọli, nke M'buliri akam ime ka unu biri nime ya, ma-ọbughi Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.

Ọnu-Ọgugu 14