Ọnu-Ọgugu 14:15-23 Bible Nso (IGBOB)

15. Ma asi na I me ka ndi nka nwua dika otù onye, mba nile ndi nuworo akukọ bayere Gi gēkwu kwa, si,

16. N'ihi na Jehova apughi ime ka ndi nka ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru ha iyi inye ha, n'ihi ya ka O b͕uworo ha n'ọzara.

17. Ma ub͕u a, biko, ka ike Onye-nwe-ayi di uku, dika I kwuworo, si,

18. Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba uba n'ebere, Ọ nāb͕aghara kwa ajọ omume na njehie, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere kwa ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.

19. Biko, b͕aghara ajọ omume nke ndi nka dika idi-uku nke ebere-Gi si di, na dika I b͕agharaworo ndi nka, site n'Ijipt we rue ub͕u a.

20. Jehova we si, Ab͕agharawom dika okwu-gi si di:

21. ma otù ọ di, Mu onwem nādi ndu, uwa nile gējuputa kwa n'ebube Jehova;

22. n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;

23. ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, ndi nile nke nēlelìm anya agaghi-ahu kwa ya:

Ọnu-Ọgugu 14