26. Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu.
27. Ha we kọrọ ya akukọ, si Ayi bara n'ala ahu ebe i zigara ayi, ọzọ kwa, ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya ka ọ bu; nka bu kwa nkpuru-ya.
28. Otú ọ di, ndi bi n'ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n'ebe ahu.
29. Amalek bi n'ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n'ugwu: ndi Kenean bi n'usọ oké osimiri, na n'akuku Jọdan.