Ọnu-Ọgugu 13:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Zigara onwe-gi ndikom, ka ha we ledo ala Kenean, nke Mu onwem nēnye umu Israel: otù nwoke otù nwoke diri ebo nna-ya-hà ka unu gēziga, onye ọ bula, ọ buru onye-isi n'etiti ha.

3. Moses we si n'ọzara Peran ziga ha n'okwu-ọnu Jehova: ha nile bu ndikom, ndi-isi umu Israel ka ha bu.

4. Ndia bu aha-ha: nke diri ebo Reuben bu Shamua nwa Zakua.

5. Nke diri ebo Simeon bu Shefat nwa Hori.

6. Nke diri ebo Juda bu Keleb nwa Jefune.

7. Nke diri ebo Isaka bu Igal nwa Josef.

Ọnu-Ọgugu 13