Ọnu-Ọgugu 13:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Zigara onwe-gi ndikom, ka ha we ledo ala Kenean, nke Mu onwem nēnye umu Israel: otù nwoke otù nwoke diri ebo nna-ya-hà ka unu gēziga, onye ọ bula, ọ buru onye-isi n'etiti ha.

3. Moses we si n'ọzara Peran ziga ha n'okwu-ọnu Jehova: ha nile bu ndikom, ndi-isi umu Israel ka ha bu.

4. Ndia bu aha-ha: nke diri ebo Reuben bu Shamua nwa Zakua.

5. Nke diri ebo Simeon bu Shefat nwa Hori.

Ọnu-Ọgugu 13