1. Jehova we gwa Moses okwu, si,
2. Zigara onwe-gi ndikom, ka ha we ledo ala Kenean, nke Mu onwem nēnye umu Israel: otù nwoke otù nwoke diri ebo nna-ya-hà ka unu gēziga, onye ọ bula, ọ buru onye-isi n'etiti ha.
3. Moses we si n'ọzara Peran ziga ha n'okwu-ọnu Jehova: ha nile bu ndikom, ndi-isi umu Israel ka ha bu.