Ọnu-Ọgugu 12:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Miriam na Eron we kwue okwu megide Moses n'ihi nwayi Etiopia ahu ọ lutara: n'ihi na nwayi Etiopia ka ọ lutara.

2. Ha we si, Ọ̀ bu ezie na nání Moses ka Jehova wereworo kwue okwu? Ọ̀ bughi kwa ayi ka o wereworo kwue okwu? Jehova we nu ya.

3. Ma nwoke ahu, bú Moses, di ume-ala n'obi nke-uku, kari madu nile ndi nọ n'elu ala.

4. Jehova we si Moses na Eron na Miriam na mberede, Putanu, unu atọ, rue ulo-ikwū nzute. Ha atọ we puta.

Ọnu-Ọgugu 12