Ọnu-Ọgugu 10:25-36 Bible Nso (IGBOB)

25. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

26. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Asha bu Pagiel nwa Ọkran.

27. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Naftali bu Ahira nwa Inan.

28. Ndia bu nbuli-ije nke umu Israel, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; ha we bulie ije.

29. Moses we si Hobab, nwa Reuel onye Midian, bú nna nwunye Moses, Ndi nēbuli ije ka ayi bu rue ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya, si, Nke ahu ka M'gēnye unu: soro ayi je, ayi gēme kwa gi nma: n'ihi na Jehova ekwuwo ezi ihe bayere Israel.

30. Ọ we si ya, M'gaghi-eje; kama alam na umu-nnam ka m'gālakuru.

31. Ọ we si, Biko, arapula ayi; n'ihi na i mara ọmuma-ulo-ikwū-ayi n'ọzara, i gābu-kwa-ra ayi anya.

32. O gēru kwa, mb͕e i soro ayi je, o gēru kwa, na ezi ihe ahu nke Jehova gēme ayi nma ya, ayi gēme kwa gi nma.

33. Ha we si n'ugwu Jehova bulie ije-ha je ije ubọchi atọ; ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova nēbuli kwa ije n'iru ha ije ubọchi atọ, ileputara ha ebe izu-ike

34. Igwe-oji nke Jehova we di n'elu ha n'ehihie, mb͕e ha si n'ọmuma-ulo-ikwū bulie ije.

35. O rue, nime nbuli-ije ib͕e ahu, na Moses nāsi, Bilie, Jehova, ka ndi-iro-Gi b͕asa; ka ndi nākpọ Gi asì b͕apu kwa n'iru Gi.

36. Ma mb͕e o zuru ike, ọ nāsi, Jehova, laghachikute ọtutu ìgwè madu ndia, bú usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.

Ọnu-Ọgugu 10