Ọnu-Ọgugu 10:17-26 Bible Nso (IGBOB)

17. Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije.

18. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

19. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai.

20. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel.

21. Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha.

22. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Efraim we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elishama nwa Amihud nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

23. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Manase bu Gameliel nwa Pedahzua.

24. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Benjamin bu Abidan nwa Gideoni.

25. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

26. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Asha bu Pagiel nwa Ọkran.

Ọnu-Ọgugu 10