24. Nke umu Gad, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;
25. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Gad, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri.
26. Nke umu Juda, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'onu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara oru arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;
27. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Juda, ha di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri.