Ọnu-Ọgugu 1:2-14 Bible Nso (IGBOB)

2. Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha nile, nwoke ọ bula, onye na isi-ya onye na isi-ya;

3. site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel, unu gāgukọta ha, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, gi onwe-gi na Eron.

4. Madu ganọye-kwa-ra unu, otù nwoke gādiri otù ebo; nwoke ọ bula, onye-isi ulo nna-ya-hà ka ọ bu.

5. Ndia bu kwa aha ndikom unu na ha gēguzo: nke Reuben; Elizua nwa Shedeua.

6. Nke Simeon; Shelumiel nwa Zurishadai.

7. Nke Juda, Nahshon nwa Aminadab.

8. Nke Isaka; Netanel nwa Zua.

9. Nke Zebulun; Eliab nwa Hilon.

10. Nke umu Josef: nke Efraim; Elishama nwa Amihud: nke Manase; Gameliel nwa Pedahzua.

11. Nke Benjamin; Abidan nwa Gideoni.

12. Nke Dan; Ahieza nwa Amishadai.

13. Nke Asha; Pagiel nwa Ọkran.

14. Nke Gad; Eliasaf nwa Deuel.

Ọnu-Ọgugu 1