Ọlu Ndi-Ozi 5:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi?

4. Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n'aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n'ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n'obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke.

5. Ma mb͕e Ananaias nuru okwu ndia ọ da n'ala, kubìe ume: ndi nile nke nuru ya we tua oké egwu.

6. Ndi bu umu-okorọbia nime ha we bilie, ke ya ákwà, ha we bupu ya lìe ya.

7. Ma ihe ra ka oge hour atọ gasiri, mb͕e nwunye-ya batara nime, nāmataghi ihe emereri.

8. Pita we za ya, si, Gwam, ọ̀ bu ihe ra otú a ka unu rere iberibe ala unu? Ọ si, E, ihe ra otú a.

Ọlu Ndi-Ozi 5