Ọlu Ndi-Ozi 5:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Ma onye-isi-nchu-àjà biliri, ya na ndi nile soro ya (nke bu irọ-òtù ndi-Sadusi), ha juputa-kwa-ra n'ekworo,

18. ha we tukwasi aka-ha n'aru ndi-ozi, tubà ha n'ulo-nkpọrọ ọra madu.

19. Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n'abali, we duputa ha, si,

20. Ganu, guzo, gwa kwa ndi-Ju n'ulo uku Chineke okwu nile nke Ndu a.

21. Ma mb͕e ha nuru nka, ha ba n'ulo uku Chineke mb͕e chi nābọ, we nēzí ihe. Ma onye-isi-nchu-àjà biara, ya na ndi soro ya, we kpọkọ nnọkọ-ikpé-ha, na nzukọ ndi-okenye umu Israel nile, we ziga n'ulo-nkpọrọ, ka ekuta ha.

Ọlu Ndi-Ozi 5