11. Nzukọ Kraist dum we tua oké egwu, ha na ndi nile ndi nuru ihe ndia.
12. Ma emere ọtutu ihe-iriba-ama na ọlu-ebube n'etiti ndi-Ju site n'aka ndi-ozi; ha nile were kwa otù obi nọ n'ìbà Solomon.
13. Ma nime ndi fọduru ọ dighi onye ọ bula nwere anya-ike iwere onwe-ya rapara ha n'aru: otú ọ di, ndi-Ju nēme ka ha di uku;
14. ewe tukwasi kari nye Onwe-nye-ayi ndi kwere na Ya, ìgwè madu ma ndkom ma ndinyom;
15. nke mere ka ha nēkupu ọbuná ndi aru nādighi ike, nēdebe ha n'amá, tọb͕ọ ha n'ihe-ndina na ute, ka, mb͕e Pita nāga, ka ọbuná nání onyinyo-ya we kpuchie otù onye nime ha.
16. Ọra madu nke obodo nile di Jerusalem buruburu we nāb͕akọ kwa, nēkuta ndi aru nādighi ike, na ndi ndi-mọ nādighi ọcha nēsob͕u: ewe me ka aru-ha nile n'otù n'otù di ike.
17. Ma onye-isi-nchu-àjà biliri, ya na ndi nile soro ya (nke bu irọ-òtù ndi-Sadusi), ha juputa-kwa-ra n'ekworo,