Ọlu Ndi-Ozi 4:2-8 Bible Nso (IGBOB)

2. ebe ike gwuru ha nọ̄ n'ihi na ha nēzi ndi-Ju ihe, nēkuwsa kwa nime Jisus nbilite site na ndi nwuru anwu.

3. Ha we tukwasi ha aka, tiye ha n'ulo-nkpọrọ rue echi-ya: n'ihi na ọ bu anyasi ub͕u a.

4. Ma ọtutu n'etiti ndi nuru okwu-ha kwere; ọnu-ọgugu ndikom ahu we rue ihe ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri.

5. O we rue n'echi-ya, na ndi-isi-ha na ndi-okenye-ha na ndi-ode-akwukwọ-ha zukọrọ na Jerusalem;

6. Anas onye-isi-nchu-àjà nọ kwa n'ebe ahu, na Kaiafas, na Jọn, na Aleksanda, na ka ha ra, bú ndi sitere n'ikwu nke onye-isi-nchu-àjà.

7. Mb͕e ha guzosiri ha n'etiti, ha jua ha, si, N'àha ike gini, ma-ọbu n'aha gini, ka unu onwe-unu mere nka?

8. Mb͕e ahu Pita, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ si ha, Ndi-isi ndi-Ju, na ndi-okenye,

Ọlu Ndi-Ozi 4