Ọlu Ndi-Ozi 4:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. Ebe ha hu-kwa-ra nwoke ahu nke emereri ka aru di ya ike ka ya na ha nēguzo, ha enweghi ihe ikwugide ya.

15. Ma mb͕e ha gwasiri ha ka ha si na nnọkọ-ikpé-ha pua n'èzí, ha b͕a ìzù n'etiti onwe-ha,

16. si, Gini ka ayi gēme madu ndia? n'ihi na ọ putara ìhè nye ndi nile bi na Jerusalem, na ọ bu ezie na emewo ihe-iriba-ama amara nke-ọma site n'aka-ha; ayi apughi kwa igọ ya.

17. Ma ka o we ghara ib͕asa kari n'etiti ndi-Ju, ka ayi bara ha nba, ka ha ghara igwa madu ọ bula okwu n'aha nka site n'ub͕u a.

18. Ha we kpọ ha, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọli ma-ọbu izí ihe n'aha Jisus.

Ọlu Ndi-Ozi 4