1. Ma mb͕e ha nāgwa ndi-Ju okwu, ndi-nchu-àjà na ọchi-agha nke ulo uku Chineke na ndi-Sadusi biakwasiri ha,
2. ebe ike gwuru ha nọ̄ n'ihi na ha nēzi ndi-Ju ihe, nēkuwsa kwa nime Jisus nbilite site na ndi nwuru anwu.
3. Ha we tukwasi ha aka, tiye ha n'ulo-nkpọrọ rue echi-ya: n'ihi na ọ bu anyasi ub͕u a.