Ọlu Ndi-Ozi 27:5-11 Bible Nso (IGBOB)

5. Mb͕e ayi gabigasiri oké osimiri nke di n'akuku Silisia na Pamfilia, ayi we rue Maira, obodo nke Lisia.

6. N'ebe ahu ka ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise huru ub͕ọ Aleksandria nke nēje Itali; o we me ka ayi ba nime ya.

7. Mb͕e ayi gasiri nwayọ ọtutu ubọchi, mb͕e ọ di kwa ayi ike iru na ncherita-iru Naidọs, ebe ifufe nēkweghi ka ayi ga n'iru ọzọ, ayi we nāga ala Krit nso, na ncherita-iru Salmoni;

8. o we di ayi ike iga n'akuku ya, ayi we rue otù ebe anākpọ Ọnu-miri Ọma; nke obodo Lasia di ya nso.

9. Ma mb͕e o ruru ọtutu oge, mb͕e ije-ub͕ọ di kwa egwu ub͕u a, n'ihi na ub͕u a ka oge Obubu-ọnu gasiri, Pọl we dọ ha aka na nti,

10. si ha, Ndikom, ahuwom na nbibi na oké iyì gaje idi n'ije-ub͕ọ a, ọ bughi nání nke ihe ub͕ọ nēbu na ub͕ọ onwe-ya, ma nke ndu-ayi kwa.

11. Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise kweyere onye-isi ub͕ọ na onye nwe ub͕ọ, kari okwu Pọl kwuru.

Ọlu Ndi-Ozi 27