3. nāchọ amara imegide ha, ka ọ kpọta ya na Jerusalem; ebe ha nēche anwu ib͕u ya n'uzọ.
4. Otú ọ di, Festọs zara, si na anēdebe Pọl na Sisaria, si kwa na ya onwe-ya gaje ilaghachi ọsọsọ.
5. Ọ si, Ya mere, ka ndi ji ike n'etiti unu som rida, ọ buru kwa na ọ di ihe ọ bula nwoke ahu mehiere, ka ha bo ya ebubo.
6. Mb͕e ọ nọsiri n'etiti ha ihe nākaghi ubọchi asatọ ma-ọbu ubọchi iri, ọ ridata na Sisaria; echi-ya o we nọdu n'oche-ikpé-ya, we si ka ekuta Pọl.
7. Mb͕e ọ biaruru, ndi-Ju ndi siworo na Jerusalem ridata we guzo ya buruburu, nēbo ya ọtutu ebubo di arọ́, nke ha nēnweghi ike igosi;
8. Pọl nāgọpu kwa onwe-ya, si, Emehieghm ma-ọli megide iwu ndi-Ju, ma-ọbu imegide ulo uku Chineke, ma-ọbu imegide Sisa.