24. ọ gwa-kwa-ra ha ka ha chita anu-ulo, ka ha we dọkwasi Pọl n'elu ha, debe kwa ya nke-ọma rue mb͕e ha gābiakute Filiks, bú onye-isi.
25. O we de akwukwọ-ozi nke yiri nka:
26. Klọdiọs Lisias nēdegara Filiks, bú onye-isi di oké ebube, akwukwọ, nēkele ya.
27. Ndi-Ju jidere nwoke a, ha gaje kwa ib͕u ya, mb͕e mu na ndi-agha biakwasiri ha, weputa ya n'aka-ha, ebe m'nutasiri na ọ bu onye Rom.
28. Ebe m'zubere imazu ihe mere ha ji bo ya ebubo, m'we kudata ya na nnọkọ-ikpé-ha: