21. eji-kwa-ra okwu-ọnu zí ha ihe bayere gi, na i nēzí ndi-Ju nile ndi nọ n'etiti ndi mba ọzọ irapu Moses, ebe i nāgwa ha ka ha ghara ibì umu-ha úgwù, ka ha ghara kwa ijeso ọme-n'ala nile nke iwu-ayi.
22. Ọ̀ bu gini kwa? ha aghaghi inu na i biawo.
23. Ya mere, me nka nke ayi nāsi gi: Ayi nwere ndikom anọ ndi nkwa ha kwere Chineke di n'isi-ha;
24. kuru ndia tiyere onwe-gi, me ka gi na ha di ọcha, kwu-kwa-ra ha ugwọ ihe ha ji chu àjà, ka ha we kọpu isi: madu nile gāmara kwa na ezi-okwu adighi n'ihe ejiwo okwu-ọnu zí ha bayere gi; kama na gi onwe-gi nāgazi kwa, nēdebe iwu-ayi.
25. Ma ayi onwe-ayi zìri akwukwọ-ozi bayere ndi mba ọzọ ndi kweworo, nēnye iwu ka ha debe onwe-ha ghara imetu ihe achuru n'àjà nye arusi aka, ha na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko.
26. Mb͕e ahu Pọl kuru ndikom ahu tiyere onwe-ya, n'ubọchi so ya o we me ka ya na ha di ọcha, we ba n'ulo uku Chineke, nēgosi nmezu ubọchi nile nke anēme ka ha di ọcha, rue mb͕e echere n'iru Chineke onyinye ahu n'ihi madu nile n'otù n'otù nime ha.