Ọlu Ndi-Ozi 21:19-24 Bible Nso (IGBOB)

19. Mb͕e ọ kelerisi ha, o we kọ akukọ ihe nile n'otù n'otù nke Chineke lururi n'etiti ndi mba ọzọ site n'ije-ozi-ya.

20. Mb͕e ha nuru ya, ha we nye Chineke otuto, ha we si ya, Nwa-nna-ayi, i huwo ka ha ra, bú ọtutu madu riri nne n'etiti ndi-Ju ndi kweworo na Jisus; obi ha nile nānu kwa ọku nye iwu-ayi:

21. eji-kwa-ra okwu-ọnu zí ha ihe bayere gi, na i nēzí ndi-Ju nile ndi nọ n'etiti ndi mba ọzọ irapu Moses, ebe i nāgwa ha ka ha ghara ibì umu-ha úgwù, ka ha ghara kwa ijeso ọme-n'ala nile nke iwu-ayi.

22. Ọ̀ bu gini kwa? ha aghaghi inu na i biawo.

23. Ya mere, me nka nke ayi nāsi gi: Ayi nwere ndikom anọ ndi nkwa ha kwere Chineke di n'isi-ha;

24. kuru ndia tiyere onwe-gi, me ka gi na ha di ọcha, kwu-kwa-ra ha ugwọ ihe ha ji chu àjà, ka ha we kọpu isi: madu nile gāmara kwa na ezi-okwu adighi n'ihe ejiwo okwu-ọnu zí ha bayere gi; kama na gi onwe-gi nāgazi kwa, nēdebe iwu-ayi.

Ọlu Ndi-Ozi 21