Ọlu Ndi-Ozi 2:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. N'ihi na manya abàghi ndia n'anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n'ututu;

16. kama nka bu nke ekwuworo site n'ọnu Joel onye-amuma, si,

17. Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru,M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu:Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma,Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù,Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:

18. E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyomKa M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.

19. M'gēnye kwa ọlu-ebube n'elu-igwe di n'elu,Na ihe-iriba-ama n'elu ala di n'okpuru ya;Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku:

Ọlu Ndi-Ozi 2