17. Ka ndi fọduru n'etiti madu we chọ Onye-nwe-ayi,Ha na mba nile, ndi aguru aham,
18. Ka Onye-nwe-ayi kwuru, Onye nēme ka amara ihe ndia site na nmalite oge a.
19. N'ihi nka uche nke mu onwem bu, ka ayi ghara isob͕u ndi si n'etiti ndi mba ọzọ chigharikute Chineke:
20. kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara.