25. Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n'Atalaia;
26. ha we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n'amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru.
27. Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.
28. Ha na ndi nēso uzọ Jisus we nọgide ọ bughi nwa oge.