Ọlu Ndi-Ozi 14:11-18 Bible Nso (IGBOB)

11. Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n'asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n'oyiyi madu.

12. Ha we kpọ Banabas, Jupita; kpọ kwa Pọl, Makuri, ebe ya onwe-ya bu onye-isi nēkwu okwu.

13. Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n'iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n'ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà.

14. Ma mb͕e ndi-ozi ahu, bú Banabas na Pọl, nuru ya, ha dọwa uwe-ha, we pua b͕abà n'etiti ìgwè madu ahu, nēti nkpu,

15. nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:

16. Onye n'ọb͕ọ nile gara aga kwere ka mba nile nāga n'uzọ nile nke aka ha.

17. Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.

18. Ma n'ikwu okwu ndia ọ di ha ike ib͕ochi ìgwè madu nile ka ha ghara ichu àjà nye ha.

Ọlu Ndi-Ozi 14