Ọlu Ndi-Ozi 13:36-40 Bible Nso (IGBOB)

36. N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré:

37. ma Onye ahu Chineke mere ka O bilie ahughi ire-uré.

38. Ya mere maranu nka, umu-nnem, na anēsite n'ọnu Onye a kwusa nb͕aghara nmehie nile nye unu:

39. ọ bu kwa nime Onye a ka anāgu onye ọ bula nke kwere na Ya n'onye ezi omume n'ihe nile, nke anāpughi igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses.

40. Ya mere lezienu anya, ka ihe ahu ghara ibiakwasi unu, nke ekwuworo n'akwukwọ ndi-amuma, si,

Ọlu Ndi-Ozi 13