Ọlu Ndi-Ozi 11:12-23 Bible Nso (IGBOB)

12. Mọ Nsọ we gwam ka m'so ha, ghara ime onwem di iche. Umu-nna-ayi isi ndia we sokwam; ayi we ba n'ulo nwoke ahu:

13. o we kọrọ ayi otú ọ hururi mọ-ozi ka o guzoro n'ulo-ya, nāsi kwa, Ziga na Jọpa, kpọta Saimon, onye anākpọ kwa Pita;

14. onye gāgwa gi okwu ufọdu, nke agēji zọputa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi nile.

15. Ma mb͕e m'malitere ikwu okwu, Mọ Nsọ dakwasiri ha, dika ọ dakwasi-kwa-ra ayi na mbu.

16. M'we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri, N'ezie Jọn jiri miri me baptism; ma agēji Mọ Nsọ me unu onwe-unu baptism.

17. Ya mere ọ buru na Chineke nyere ha onyinye ra ka nke O nye-kwa-ra ayi, mb͕e ayi kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Mù onwem bu onye ipu ib͕ochi Chineke?

18. Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ha kpuchiri ọnu-ha, we nye Chineke otuto, si, Ya mere ọ bu kwa ndi mba ọzọ ka Chineke nyere nchèghari nke nēdubà na ndu.

19. Ya mere ndi b͕asara site na nkpab͕u nke putara n'ihi Stifen jeruru Finisia, na Saiprọs, na Antiọk, ha adighi-agwa onye ọ bula okwu Chineke ma-ọbughi nání ndi-Ju.

20. Ma ufọdu di n'etiti ha, ndikom nke Saiprọs na Sairini, ndi, mb͕e ha biaruru Antiọk, ha gwa kwa ndi-Grik okwu ahu, nēzisa ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus.

21. Aka Onye-nwe-ayi we so ha: oké ìgwè ndi kwere we chigharikute Onye-nwe-ayi.

22. Akukọ bayere ha we ba na nti nzukọ Kraist di na Jerusalem: ha we zipu Banabas ije rue Antiọk:

23. onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ:

Ọlu Ndi-Ozi 11