Ọlu Ndi-Ozi 11:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi-ozi na umu-nna nime Kraist ndi nọ na Judia dum nuru na ndi mba ọzọ nara-kwa-ri okwu Chineke nke-ọma.

2. Mb͕e Pita rigotara Jerusalem, ndi sitere na ndi obibì-úgwù we kwugide ya okwu,

3. si, I bakuru ndikom ndi anēbighi úgwù, so ha rie ihe.

4. Ma Pita malitere, we kọrọ ha okwu ahu n'usoro, si,

5. Mu onwem nọ n'obodo Jọpa nēkpere: m'we hu ọhù nime inyoghi, otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha nke anēsi n'elu-igwe were nkuku anọ eweda n'ala; o we bia rue ọbuná n'ebe m'nọ:

6. mb͕e m'legidere ya anya, m'we tugharia uche, hu anu ukwu anọ di n'uwa na anu-ọhia na ihe nākpu akpu na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche.

7. M'we nu kwa otù olu ka ọ nāsim, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa.

8. Ma asirim, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ihe ọ bula nke ruru arú ma-ọbu nke nādighi ọcha bàra n'ọnum.

9. Ma otù olu zara nke ub͕ò abua site n'elu-igwe, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru arú.

Ọlu Ndi-Ozi 11