Ọlu Ndi-Ozi 11:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi-ozi na umu-nna nime Kraist ndi nọ na Judia dum nuru na ndi mba ọzọ nara-kwa-ri okwu Chineke nke-ọma.

2. Mb͕e Pita rigotara Jerusalem, ndi sitere na ndi obibì-úgwù we kwugide ya okwu,

3. si, I bakuru ndikom ndi anēbighi úgwù, so ha rie ihe.

4. Ma Pita malitere, we kọrọ ha okwu ahu n'usoro, si,

5. Mu onwem nọ n'obodo Jọpa nēkpere: m'we hu ọhù nime inyoghi, otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha nke anēsi n'elu-igwe were nkuku anọ eweda n'ala; o we bia rue ọbuná n'ebe m'nọ:

6. mb͕e m'legidere ya anya, m'we tugharia uche, hu anu ukwu anọ di n'uwa na anu-ọhia na ihe nākpu akpu na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche.

7. M'we nu kwa otù olu ka ọ nāsim, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa.

8. Ma asirim, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ihe ọ bula nke ruru arú ma-ọbu nke nādighi ọcha bàra n'ọnum.

9. Ma otù olu zara nke ub͕ò abua site n'elu-igwe, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru arú.

10. Ewe me nka ub͕ò atọ: ewe dọlie ha nile ọzọ n'elu-igwe.

11. Ma le, n'otù oge ahu ndikom atọ guzoro n'iru ulo nke ayi nọ nime ya, ebe esiri na Sisaria ziterem ha.

12. Mọ Nsọ we gwam ka m'so ha, ghara ime onwem di iche. Umu-nna-ayi isi ndia we sokwam; ayi we ba n'ulo nwoke ahu:

13. o we kọrọ ayi otú ọ hururi mọ-ozi ka o guzoro n'ulo-ya, nāsi kwa, Ziga na Jọpa, kpọta Saimon, onye anākpọ kwa Pita;

Ọlu Ndi-Ozi 11