1. Ma ndi-ozi na umu-nna nime Kraist ndi nọ na Judia dum nuru na ndi mba ọzọ nara-kwa-ri okwu Chineke nke-ọma.
2. Mb͕e Pita rigotara Jerusalem, ndi sitere na ndi obibì-úgwù we kwugide ya okwu,
3. si, I bakuru ndikom ndi anēbighi úgwù, so ha rie ihe.
4. Ma Pita malitere, we kọrọ ha okwu ahu n'usoro, si,
5. Mu onwem nọ n'obodo Jọpa nēkpere: m'we hu ọhù nime inyoghi, otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha nke anēsi n'elu-igwe were nkuku anọ eweda n'ala; o we bia rue ọbuná n'ebe m'nọ:
6. mb͕e m'legidere ya anya, m'we tugharia uche, hu anu ukwu anọ di n'uwa na anu-ọhia na ihe nākpu akpu na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche.
7. M'we nu kwa otù olu ka ọ nāsim, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa.
8. Ma asirim, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ihe ọ bula nke ruru arú ma-ọbu nke nādighi ọcha bàra n'ọnum.
9. Ma otù olu zara nke ub͕ò abua site n'elu-igwe, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru arú.
10. Ewe me nka ub͕ò atọ: ewe dọlie ha nile ọzọ n'elu-igwe.
11. Ma le, n'otù oge ahu ndikom atọ guzoro n'iru ulo nke ayi nọ nime ya, ebe esiri na Sisaria ziterem ha.