Nkpughe 9:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.

7. Oyiyi igurube ahu yiri inyinya edoziworo ije agha; n'isi-ha ka ha nēkpu ihe dika okpu-eze yiri ọla-edo, iru-ha di kwa ka iru madu.

8. Ha nwe-kwa-ra agiri-isi dika agiri-isi ndinyom, ezé-ha di kwa ka ezé ọdum.

9. Ha nwe-kwa-ra ihe-agha ib͕ochi obi, dika ihe-agha ib͕ochi obi nke ígwè; nkpatu nkù-ha di kwa ka nkpatu nke ub͕ọ-ala, nke ọtutu inyinya nāb͕a ọsọ ije agha.

10. Ha nwe-kwa-ra ọdudù yiri ọdudù akpi, nwe ihe-ọb͕ub͕a; nime ọdudù-ha ike-ha di imejọ madu ọnwa ise.

11. Ha nwere mọ-ozi ahu nke abyss ahu dika eze-ha: aha-ya n'asusu Hibru bu Abadon, n'asusu Grik o nwe-kwa-ra aha Apọlion.

12. Ahuhu mbu agabigawo: le, ahuhu abua ọzọ fọduru ibia, mb͕e ihe ndia gasiri.

13. Mọ-ozi nke-isi we fùa opì, m'we nu otù olu nke si na mpi nke ebe-ichu-àjà ahu eji ọla-edo me puta, bú nke di n'iru Chineke,

14. M'we nu otù onye, ka ọ nāgwa mọ-ozi nke-isi ahu okwu, bú onye nwere opì ahu, si, Tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu ndi ekeworo ab͕u n'osimiri uku Yufretis.

15. Ewe tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu, ndi edoziriri nye oge hour na ubọchi na ọnwa na arọ ahu, ka ha we b͕ue otù uzọ n'uzọ atọ nke madu.

16. Ọnu-ọgugu usu-ndi-agha ahu, nke bu ndi-inyinya, di ọgu million iri: anurum ọnu-ọgugu-ha.

17. Otù a ka m'hu-kwa-ra inyinya ahu n'ọhù ahu, ha na ndi nānọkwasi ha, nēnwe ihe-agha ihe-agha ib͕ochi obi nke yiri ọku na hyacinth na brimstone: isi inyinya ahu di kwa ka isi ọdum; ọku na anwuru-ọku na brimstone nēsi kwa n'ọnu-ha puta.

Nkpughe 9