Nkpughe 9:13-16 Bible Nso (IGBOB)

13. Mọ-ozi nke-isi we fùa opì, m'we nu otù olu nke si na mpi nke ebe-ichu-àjà ahu eji ọla-edo me puta, bú nke di n'iru Chineke,

14. M'we nu otù onye, ka ọ nāgwa mọ-ozi nke-isi ahu okwu, bú onye nwere opì ahu, si, Tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu ndi ekeworo ab͕u n'osimiri uku Yufretis.

15. Ewe tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu, ndi edoziriri nye oge hour na ubọchi na ọnwa na arọ ahu, ka ha we b͕ue otù uzọ n'uzọ atọ nke madu.

16. Ọnu-ọgugu usu-ndi-agha ahu, nke bu ndi-inyinya, di ọgu million iri: anurum ọnu-ọgugu-ha.

Nkpughe 9