3. Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n'elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n'ekpere ndi nsọ nile nke di n'elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n'iru oche-eze ahu.
4. Anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ahu soro ekpere ndi nsọ site n'aka mọ-ozi ahu rigo n'iru Chineke.
5. Mọ-ozi ahu we were ihe ahu eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpojue ya n-ọku nke sitere n'ọku nke ebe-ichu-àjà ahu, we tubà ya n'uwa: éb͕è-elu-igwe, na olu na àmùmà, na ala-ọma-jijiji we so.
6. Ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere opì asa ahu doziri onwe-ha ifù opì.
7. Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.
8. Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n'uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara;
9. otù uzọ n'uzọ atọ nke ihe nile ekère èkè nke di n'oké osimiri we nwua, bú ihe nwere ndu; emebi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke ub͕ọ nile.
10. Mọ-ozi nke-atọ we fùa opì, oké kpakpando we site n'elu-igwe da, nke nēre ọku dika ọwa, o we da n'elu otù uzọ n'uzọ atọ nke osimiri nile, da kwa n'elu isi-iyi miri nile;
11. aha anākpọ kwa kpakpando ahu bu Wormwood: otù uzọ n'uzọ atọ nke miri nile we ghọ wormwood; ọtutu madu we site n'iṅu miri ahu nwua, n'ihi na emere ka ha nēlu ilu.
12. Mọ-ozi nke-anọ we fùa opì, ewe tie otù uzọ atọ nke anyanwu ihe, ya na otù uzọ n'uzọ atọ nke ọnwa, na otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nile; ka otù uzọ n'uzọ atọ nime ha we b͕a ọchichiri, ka ehihie we ghara kwa iputa ìhè n'otù uzọ n'uzọ atọ nime ya, ka ọchichiri we me kwa otú a.