Nkpughe 8:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-asa, ewe dere ji n'elu-igwe oge ra ka nkera nke otù hour.

2. M'we hu ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nēguzo n'iru Chineke; ewe nye ha opì asa.

3. Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n'elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n'ekpere ndi nsọ nile nke di n'elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n'iru oche-eze ahu.

4. Anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ahu soro ekpere ndi nsọ site n'aka mọ-ozi ahu rigo n'iru Chineke.

5. Mọ-ozi ahu we were ihe ahu eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpojue ya n-ọku nke sitere n'ọku nke ebe-ichu-àjà ahu, we tubà ya n'uwa: éb͕è-elu-igwe, na olu na àmùmà, na ala-ọma-jijiji we so.

6. Ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere opì asa ahu doziri onwe-ha ifù opì.

7. Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.

8. Mọ-ozi nke-abua we fùa opì, ewe tubà ihe dika oké ugwu nke nēre ọku nime oké osimiri: otù uzọ n'uzọ atọ nke oké osimiri we ghọ ọbara;

9. otù uzọ n'uzọ atọ nke ihe nile ekère èkè nke di n'oké osimiri we nwua, bú ihe nwere ndu; emebi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke ub͕ọ nile.

Nkpughe 8