3. Ọ dighi kwa onye ọ bula di n'elu-igwe, ma-ọbu n'elu uwa, ma-ọbu n'okpuru uwa, puru isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya.
4. M'we kwa ákwá nke-uku, n'ihi na ahughi onye ọ bula kwesiri isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya:
5. otù onye n'etiti ndi-okenye ahu we sim, Akwala ákwá: le, Ọdum ahu Nke si n'ebo Juda puta, Onye bu Nkpọrọgwu nke Devid, O kwesiri, isaghe akwukwọ ahu na akàrà-ya asa.
6. M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.
7. O we bia, Ọ narawo kwa akwukwọ ahu n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu.