Nkpughe 5:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we hu akwukwọ nke edere ya-ri ihe n'ime na azu, nke eji-kwa-rari akàrà asa kasie ya ike, ka ọ di n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu.

2. M'we hu mọ-ozi di ike, ka o nēwere oké olu nēkwusa, si, Ònye kwesiri isaghe akwukwọ ahu, na inyawapu akàrà-ya?

3. Ọ dighi kwa onye ọ bula di n'elu-igwe, ma-ọbu n'elu uwa, ma-ọbu n'okpuru uwa, puru isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya.

4. M'we kwa ákwá nke-uku, n'ihi na ahughi onye ọ bula kwesiri isaghe akwukwọ ahu, ma-ọbu ile ya anya:

Nkpughe 5