20. Le, anameguzo n'ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M'gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie.
21. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o som nọdu ala n'oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n'oche-eze-Ya.
22. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.