Nkpughe 20:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we hu mọ-ozi ka o nēsi n'elu-igwe ridata, nēji nkpisi-ugodi nke abyss ahu n'aka-ya, ya na oké nkpọrọ.

2. O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri,

3. we tubà ya nime abyss ahu, mechie ya, kà kwa ya akàrà n'elu ya, ka o we ghara iduhie mba nile ọzọ, rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi: mb͕e arọ ndia gasiri aghaghi itọpu ya nwa oge.

Nkpughe 20