Nkpughe 15:6-8 Bible Nso (IGBOB)

6. ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ihe-otiti asa ahu we si n'ulo nsọ ahu puta, eb͕okwasiworo ha linen, nke di ọcha nēnwu kwa enwu, ekewo kwa ha ihe-ọkiké ọla-edo n'obi gburugburu.

7. Otù nime ihe anọ ahu nke di ndu we nye ndi-mọ-ozi asa ahu ọkwa ọla-edo asa juputara n'ọnuma Chineke, Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi.

8. Ulo nsọ ahu we juputa n'anwuru-ọku nke si n'ebube Chineke puta, si kwa n'ike-Ya puta; ọ dighi kwa onye ọ bula puru ibà nime ulo nsọ ahu, rue mb͕e ihe-otiti asa ahu nke ndi-mọ-ozi asa ahu gāgwu.

Nkpughe 15