9. N'ihi na ha nile nēme ka ayi tua egwu, si, Aka-ha gākudapu n'ije-ozi a, agaghi-eje kwa ya. Ma ub͕u a Gi me ka akam abua di ike.
10. Ma mu onwem batara n'ulo Shemaia nwa Delaia nwa Mehetabel, ma emechidoworo onye ahu uzọ; o we si, Ka ayi zukọta n'ulo Chineke, n'etiti ulo uku Chineke, ka ayi mechi kwa uzọ nile nke ulo uku Chineke: n'ihi na ha nābia ib͕u gi; e, n'abali ka ha nābia ib͕u gi.
11. M'we si, Nwoke dika mu onwem, ọ̀ gāb͕alaga? ònye di kwa, nke di ka mu onwem, nke gābà n'ulo uku Chineke, we di ndu? m'gaghi-abà nime.