5. Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n'etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile.
6. Iwem we di ọku nke-uku mb͕e m'nuru iti-nkpu-ha na okwu ndia.
7. Obim we duam ọdu, mu na ndi amara aha-ha na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si ha, Ọmuru-nwa ka unu onwe-unu nānara, nwoke ọ bula n'aka nwa-nne-ya. M'we nwe nkpọkọta uku megide ha.
8. M'we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza.
9. M'we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n'egwu Chineke ka unu gējeghari, n'ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi?
10. Ọzọ kwa, mu onwem na umu-nnem na ndi nējerem ozi nēbinye ha ego na ọka n'ọmuru-nwa. Biko, ka ayi rapu ọmuru-nwa nka.
11. Biko, burunu uzọ nyeghachi ha ubi nile ha, na ubi-vine nile ha, na ubi-olive nile ha, na ulo nile ha, na otù uzọ n'ọgu uzọ ise nke ego, na nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, nke unu nānara ha n'ọmuru-nwa.
12. Ha we si, Ayi gēnyeghachi ha, ayi agaghi-achọ kwa ihe n'aka ha; otú a ka ayi gēme, dika gi onwe-gi nēkwu. M'we kpọ ndi-nchu-àjà, me ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di.
13. Arurupu-kwa-ram obi-uwem, si, Ka Chineke rurupu nwoke ọ bula otú a site n'ulo-ya, site kwa na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, bú onye nādighi-eme ka okwu a guzosie ike; ọbuná otú a ya bu ihe arurupuworo, nke tọb͕ọ-kwa-ra n'efu. Nkpọkọta ahu nile we si, Amen, ha we to Jehova. Ndi-ayi we me dika okwu a si di.
14. Ọzọ, site n'ubọchi o nyerem iwu ibu onye nāchi ha n'ala Juda, site n'arọ nke-orú we rue arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Ataksakses, bú eze, nke ahu bu arọ iri na abua, mu onwem na umu-nnem erighi nri nke onye nāchi ala.
15. Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n'achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n'ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n'ihi egwu Chineke.
16. Ọzọ kwa, m'jisiri ike n'ije-ozi mb͕idi a, ọ dighi kwa ubi ayi zutara: ma achikọtawo ndi nile nējerem ozi n'ebe ahu ije ozi ahu.
17. Ọzọ, ndi-Ju na ndi nọchiri anya eze, bú ọgụ ndikom asa na iri, nọ na table nkem, ha na ndi nābiakute ayi site na mba ndi di ayi buruburu.