Nehemaia 5:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Oké iti-nkpu nke ndi-ayi na ndinyom-ha we di megide umu-nne-ha, bú ndi-Ju.

2. N'ihi na ufọdu di ndi nāsi, Ayi onwe-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom, di ọtutu: kwe ka ayi nara ọka, ka ayi we rie ihe, we di ndu.

3. Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile na ulo-ayi nile ka ayi nēdo n'ibé: kwe ka ayi nara ọka, n'ihi oké unwu a.

4. Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ayi ewerewo ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile biri ego itu utu-ala eze.

Nehemaia 5