Nehemaia 3:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. N'akuku ha ka Refaia nwa Hua, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike.

10. N'akuku ha ka Jedaia nwa Harumaf mere ka mb͕idi di ike, bú na ncherita-iru ulo-ya. N'akuku ya ka Hatush nwa Hashabneia mere ka mb͕idi di ike.

11. Malkija nwa Harim na Hashub nwa Pahat-moab mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, bú ulo-elu nke ite-ọku uku.

12. N'akuku ya ka Shalum nwa Halohesh, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom.

13. Ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ka Hanun na ndi bi na Zanoa mere ka ọ di ike; ndi ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na nnù cubit mb͕idi abua na ọgu iri rue ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia.

14. Ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia ka Malkija nwa Rikab, bú onye-isi ala di Bet-hakerem buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.

15. Ọnu-uzọ-ama isi-iyi ka Shalun nwa Kọl-hoze, bú onye-isi ala di Mizpa buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, kpue ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na mb͕idi ọdọ-miri Shela, rue ubi eze ab͕ara ogige, ru kwa ihe-nrigo nke nēsi n'obodo Devid rida.

16. N'iso ya ka Nehemaia nwa Azbuk, bú onye-isi nkera ala di Bet-zua buruburu, mere ka mb͕idi di ike, rue na ncherita-iru ílì Devid, ru kwa ọdọ-miri nke emere, ru kwa ulo ndi-dike.

17. N'iso ya ka ndi Livai, Rehum nwa Bani, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hashabaia, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi diri buruburu-ala-ya ike.

18. N'iso ya ka umu-nne-ha, na Bavai nwa Henadad, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi di ike.

Nehemaia 3