5. N'akuku ha ka ndi Tekoa mere ka mb͕idi di ike; ma ndi-ha ndi di ebube etiyeghi olu-ha n'òfùfè Onye-nwe-ha.
6. Ọnu-uzọ-ama ochie ka Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia mere ka ọ di ike; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.
7. N'akuku ha ka Melataia, bú onye Gibeon, na Jadon, bú onye Meronot, ndikom Gibeon na Mizpa, mere ka mb͕idi di ike rue oche-eze nke onye nāchi ala n'ofè osimiri.
8. N'akuku ya ka Uziel nwa Hahaia, bú ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hananaia, bú otù onye nime ndi nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, mere ka mb͕idi di ike, ha we rapu Jerusalem rue mb͕idi di obosara.
9. N'akuku ha ka Refaia nwa Hua, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike.
10. N'akuku ha ka Jedaia nwa Harumaf mere ka mb͕idi di ike, bú na ncherita-iru ulo-ya. N'akuku ya ka Hatush nwa Hashabneia mere ka mb͕idi di ike.
11. Malkija nwa Harim na Hashub nwa Pahat-moab mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, bú ulo-elu nke ite-ọku uku.
12. N'akuku ya ka Shalum nwa Halohesh, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom.
13. Ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ka Hanun na ndi bi na Zanoa mere ka ọ di ike; ndi ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na nnù cubit mb͕idi abua na ọgu iri rue ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia.
14. Ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia ka Malkija nwa Rikab, bú onye-isi ala di Bet-hakerem buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.
15. Ọnu-uzọ-ama isi-iyi ka Shalun nwa Kọl-hoze, bú onye-isi ala di Mizpa buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, kpue ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na mb͕idi ọdọ-miri Shela, rue ubi eze ab͕ara ogige, ru kwa ihe-nrigo nke nēsi n'obodo Devid rida.
16. N'iso ya ka Nehemaia nwa Azbuk, bú onye-isi nkera ala di Bet-zua buruburu, mere ka mb͕idi di ike, rue na ncherita-iru ílì Devid, ru kwa ọdọ-miri nke emere, ru kwa ulo ndi-dike.
17. N'iso ya ka ndi Livai, Rehum nwa Bani, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hashabaia, bú onye-isi nkera ala di Keila buruburu, mere ka mb͕idi diri buruburu-ala-ya ike.