Nehemaia 3:21-27 Bible Nso (IGBOB)

21. N'iso ya ka Meremot nwa Uraia nwa Hakoz mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ọnu-uzọ ulo Elaiashib we rue nsọtu ulo Elaiashib.

22. N'iso ya ka ndi-nchu-àjà, bú ndikom nke Buruburu-ala, mere ka mb͕idi di ike.

23. N'iso ha ka Benjamin na Hashub mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ha. N'iso ha ka Azaraia nwa Maaseia nwa Ananaia mere ka mb͕idi di ike n'akuku ulo-ya.

24. N'iso ya ka Binui nwa Henadad mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ulo Azaraia rue nkuku mb͕idi, ọbuná rue ulo-elu nkuku.

25. Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n'ulo di n'elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N'iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike.

26. (Ma Netinim nēbi n'Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa.)

27. N'iso ya ka ndi Tekoa mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita ulo-elu di uku nke nāputa aputa, we rue mb͕idi Ofel.

Nehemaia 3