Nehemaia 2:13-15 Bible Nso (IGBOB)

13. M'we si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n'abali, we rue n'iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile.

14. M'we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi, ru kwa ọdọ-miri eze: ọ dighi kwa ebe anu-ulo nke di n'okpurum gāgabiga.

15. M'we nārigo na miri-iyi n'abali, m'we nēle mb͕idi ahu anya; m'we chigharia, ba n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, we laghachi.

Nehemaia 2