8. O we dim njọ nke-uku: m'we si n'ime-ulo ahu tupu ihe nile nke ulo Tobaia n'èzí.
9. M'we kwue, ha we me ka ime-ulo nile di ọcha: m'we chighachi n'ebe ahu ihe ulo Chineke, ha na onyinye-inata-iru-ọma na frankincense.
10. M'we mata na enyeghi òkè ndi Livai enye; ndi Livai na ndi-ọbù-abù, bú ndi nēje ozi ahu, we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ubi-ya.
11. Mu na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si, Gini mere arapuworo ulo Chineke? M'we chikọta ha, guzo ha n'ebe-nguzo-ha.
12. Juda nile we webata otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ulo-àkù.
13. M'we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n'akuku ha: n'ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.
14. Chinekem, chetam n'ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m'meworo n'ulo Chinekem, na n'ihe-ndebe-ya nile.