Nehemaia 13:22-30 Bible Nso (IGBOB)

22. M'we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di.

23. Ọzọ, na mb͕e ahu ka m'huru ndi-Ju ndi lutara nwunye ndi bu ndinyom Ashdod na ndinyom Amon na ndinyom Moab:

24. umu-ha we nēkwu okwu nkera n'asusu Ashdod, ha amataghi kwa ikwu okwu n'asusu ndi-Ju, kama dika asusu uzọ ndi abua ahu si di.

25. Mu na ha we se okwu, m'we kọcha ha, tie ufọdu nime ha aka, kwopu agiri-isi-ha, me ka ha were Chineke ṅua iyi, si, Unu ewela umu-unu ndinyom nye umu-ha ndikom, unu aluta-kwa-lara umu-unu ndikom, ma-ọbu onwe-unu, umu-ha ndinyom.

26. Ọ̀ bughi n'ihe ndia ka Solomon, bú eze Israel, mehiere? ma n'etiti ọtutu mba ọ dighi eze di ka ya, onye Chineke huru n'anya ka ọ bu kwa, Chineke we me ya eze Israel nile: ọbuná onye ahu ka ndinyom ala ọzọ mere ka o mehie.

27. Ọ̀ bu kwa unu ka ayi gēge nti ime ihe ọjọ uku a nile, imekpu emekpu megide Chineke-ayi n'iluta ndinyom ala ọzọ?

28. Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m'we me ka ọ b͕apu n'ebe m'nọ.

29. Chinekem, cheta ha, n'ihi na ha emewo ka agua ọlu-nchu-àjà, na ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà, na nke ndi Livai, n'ihe nādighi nsọ.

30. Eme-kwa-ram ka ha puta n'ebe onye ala ọzọ ọ bula nọ di ọcha, m'we guzoro ndi-nchu-àjà, guzo-kwa-ra ndi Livai, ihe-ndebe, nwoke ọ bula n'ije-ozi-ya;

Nehemaia 13