11. Mu na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si, Gini mere arapuworo ulo Chineke? M'we chikọta ha, guzo ha n'ebe-nguzo-ha.
12. Juda nile we webata otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ulo-àkù.
13. M'we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n'akuku ha: n'ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.
14. Chinekem, chetam n'ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m'meworo n'ulo Chinekem, na n'ihe-ndebe-ya nile.
15. Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri.
16. Ndi Taia bi-kwa-ra nime ya, ndi nēwebata azù, na ihe nile ọ bula anēre ere, ha nērenye kwa ha umu Juda n'ubọchi-izu-ike, na nime Jerusalem.
17. Mu na ndi amara aha-ha nime Juda we se okwu, m'we si ha, Gini bu ihe ọjọ a nke unu onwe-unu nēme, nēme kwa ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ?
18. Ọ̀ bughi otú a ka nna-unu-hà mere, Chineke-ayi we me ka ihe ọjọ a nile biakwasi ayi, biakwasi kwa obodo a? ma unu onwe-unu nātukwasi ihe n'ihe di ọku di n'aru Israel, n'ime ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ.
19. O rue, mb͕e ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem nāb͕a ọchichiri tutu ubọchi-izu-ike erue, na asirim ka emechie uzọ nile, m'si kwa ka aghara imeghe ha rue mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri: m'we guzo ufọdu nime ndi nējerem ozi n'ọnu-uzọ-ama, ka aghara ibubata ibu nime n'ubọchi-izu-ike.
20. Ndi nāzu ahia na ndi nēre ihe ọ bula nke anēre ere we nọ ọnọdu-abali n'azu Jerusalem otù ub͕ò ma-ọbu ub͕ò abua.
21. M'we b͕a àmà megide ha, si ha, Gini mere unu onwe-unu nānọ ọnọdu-abali na ncherita-iru mb͕idi? ọ buru na unu eme ya ọzọ, m'gēseti aka megide unu. Site na mb͕e ahu ha abiaghi n'ubọchi-izu-ike.
22. M'we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di.